Monday, 12 December 2016

NKỌRỌ ASỤSỤ IGBO... ASỤSỤ IGBO GA-ADỊRỊRỊ!!! Buhari... Ndị Amị... Ehi Na Ndị Fulani... 'PythonDance”... Ndị Igbo...Wdg

By: Alokwem, Michael Chuka +2348165287276, +2349080930784; mchuka2@gmail.com, http://www.odeniigbo.com.

Ndị Igbo kwuru okwu were sị na nwunyedi chọọ ịchọ okwu, ọ gwa nwunye nwa ya, na ya, nye ya mmanụ ka ọ were taa akwụ. N'ụbọchị ọnwa Nọvemba dị na mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na asaa, ka ndị amị nke Naijiria bidoro ihe ngosi onwe nke ha kpọrọ, “pythonDance”n'ala Igbo. Ihe nke a bụ n'izu ndị“AmnestyInternational”, mere ka ụwa mara na ndị Amị Naijiria egbuola mmadụ ruru otu narị na iri ise, bụndị Igbo na-achọ nwere onwe ha, kemgbe otu afọ na ọkara.
Ndị Amnesti gosiri ihe nkiri dị iche iche iji gosịpụta nchọpụta ha, ma ebe ndị amị na-awụ onye otu IPOB “acid”, ma etu ndị amị siri gbagbuo ọtụtụ ndịn'Aba na n'Ọnịcha. Kedu ihe ndị Amị Naijria kwuru màọbụ mere maka nke a? Ha kwuru na ọ bụ asị, na ọ bụ “nanị” mmadụ ise ka ha gburu. Ya bụ ka anyị kụọrụ ha aka. Nanị ete ka a rọrọarọ ọ kwụrụ, a rọọ eziokwu arọ, ọtọghee. Ugbu a, ha egburukwana bata ọzọn'ọgbọ. Ha abịara igosi anyị ike ha? Ha abịara ka anyị tụba egwu? Ha abịara igosi anyị na ha nwe obodo? Ka ha abịara maka ezi ebumnobi? Ka anyị na-aga n'ubi ka ọka na-aka. A dịghị ata ozu nshịkọ na nzuzo.
Kedu ihe kpatara ndị amị jiri bido ngosi onwe ”PythonDance”? Ha kwuru na tigbuo zọgbuo jupụtara na mpaghara anyị bụ ala Igbo na Naijiria, na ndị ntọrọ mmadụ karịrị akarị, ndị ohi jupụtara ka nsi ọgbagwụ, ndị na-achị ehi na ndị oru ugbo nọ n'agha, obodo na obodo n'ala Igbonọ n'agha, na ndị na-achọ nwere onwe, ji aka ike were emebisi ihe. N'ihi ihe ndị a, ha kwuru na ha ga-anọ n'ebe otu ọnwa iji wete ihe nile ndị a na njedebe. N'eziokwu, amaghị m na nnukwu tigbuo zọgbuo jupụtara n'ala Igbo, mgbe ndị amị kwupụtara nke a, e wepụtara ihe ndị bekee kpọrọ “Google Map” ka m marakwa na ọ bụ n'ala Igbo ka m ka bi. A chọpụtara m na ọ bụ ebe m nọ ka m ka nọ. Amaghịzi m ebe ndị amị siri were hụchata gidigidigidi na-ada na mpaghara anyị a na Naijiria, ka ọ bụ na ha bịara ka ha wetere anyị ya bụ gidigidigidi?Ọnọzi ọdụ ka mmadụ i kụrụ gị aka n'ụzọ, ebe gị na nwunye gị na-eri nri, gwa gị na ọ bịara ikpe udo na etiti gị na nwunye gị, nke a bụ n'agbanyeghi na ụnụ enweghị esemokwu, ya na kwazi na ụnụ akpọghị ya bụ onye ka ọbịà kpee udo. Nanị otu ihe ka ọ ga-abụndịamị kwuo na ha bịara maka ya, ma tinye isi na ya, o kwe onye ọbụla nghọta. Ihe ahụ bụ mkpa mkpa na ajọ chi nke ndị Fulani na-achị ehi na-ebute n'ala anyị. Ma ka anyị nụ ihe Buhari kwuru maka ha.
Kemgbe otu afọ na ọkara, o nwebeghị ndị, ka ndị Fulani were kwafuo ọbara ndị Naijiria, ndịamị, ndi uwe ojii na ndị BokoHarama hụbeghị azụ ha anya. Mana kedu ihe onyeisi ala bụ Buhari, onye nke emekwaziri nna ndị Fulani na-achị ehi kwuru màọbụ mere maka ihe nke a? Ọ gbara nkịtị kwere ekwe, o ji nkịtị ọ gbachịrị nye ndị Fulani nkwado, onye nna ya dugara ohi na-eji ụkwụ agbawa ụzọ. Ọ bụ mgbe,ụwa nile tikuru, na mmadụ a nọzikwa na obodo a, gbasara mkpochapụ ndị Fulani na-achị ehi na-eme ndị Benue, ka Buhari pịaranku anya ya elu na ala, kwuo otu okwu, nke isi okwu ya bụ onye achọzinandị Fulani na-achị ehi okwu ka udo were dịrị ha. Buhari gosiri ịhụnanya o nwere n'ebe ehi dị, karịa ndụ mmadụ. Gee ntị n'okwu ya nile, kama o ga-ekwupụtaarụndị na-achị ehi na-eme, kama ya o kwuo na “CattleRustling” ya bụndị na-ezu ehi bụ nsogbu anyị nwere na Naijiria. Ka ọhụrụ na oke na ngwere mazi ihe ọjọọọ na-akwado, ọ gwara anyị na ndịahụ abụghị ndị Fulani kama na ọ bụndị na-achị ehi si na “Mauritania na Libya”. Ọdịkwanụ ka asị na onyeisi ala anyị a, e kwere n'aka?
Anyị nọ na-ele anya chee na ihe na-ebe ka toro aka. Ndị Fulani na-achị ehi awakpodo anyị, were ọtụtụmmadụ gosịpụta ajọ obi ha na Enugwu, chụpụ obodo ma kwado ịnapụ ha ala ha, iji mee ebe ehi ha ga na-ata nri. Ka m jụkwa ajụjụ, mmadụ ise ndị Fulani ahụ ejidere n'Enugwu aka ha dị na ihe merenụ, kedu ebe ha nọ ugbu a? Naijiria ka anyị nọ. Kemgbe ndị Fulani bidoro mebe mpụ a, ịgụtaran'akwụkwọ màọbụ nụtụ ebe ọbụla na ndịamị jidere ndị a na-achị ehi, a maa ha ikpe ma tinye ha na mkpọrọ? Oolo ihe i ga-anụ bụ na ndịamị jidere ndị na-emekpa ndị na-achị ehi ahụ, ndị na-ezu ehi ha, wee dịrịgabazie. Ịchọ ha okwu dizi ka ọnọọdụ ka ịkpa agụ aka n'ọdụ, agụahụ bụndịamị. Ihe nile ha mere n'Agatu, ndịamị Naijiria enwudeghi ka ọ bụ nanị otu n'ime ha, ma ya fọduziendị uwe ojii na ndịkpọrọ onwe ha ndị DSS ndị nke ji asị eri nri. Ha nile bụ na ndịdịka mụ na gị ka ha na-ezu ike. Mgbe ndị ọchịchị ime obodo dị iche iche si ala Igbo gara hụ Buhari n'izu gara aga, gbasara ihe metụtarandị Igbo, kedu ihe Buhari kwuru maka mmekpa ahụndị na-achị ehi? Ọchị na-atọ m, Buhari kwuru na ọ ga-agba mbọ hụ na “CattleRustling” ya bụ izu ehi, kwụsịrị n'ala Igbo. O chi m ooo!
Ọtụtụ ndị Igbo na-eme ka enyinnụnụ, enyinnụnụ na-eme ihe chụba ya ọsọ, ọgbagide o zonaa isi ya n'aja. Ebumnobi ya bụ na dị ka o mere nke a, na ihe ahụ agaghịzị ahụ ya, maka na ya na onwe ya anaghịzi ahụ ya bụ ihe, tinyere na isi ya zoro n'aja. O chefuru na nnukwu ike ya gheeoghe na-agwa mgbọ egbe, were m mee ihe masịrịgị.
Anyị chere na anyị na-eme ka a ga-asị na ihe dị mma, ebe ihe na-aghatọsị, ihe ejiri maka ya dị mma. Onye ọbụla nwere anya nka, ga-achọpụta na otuihe siri gbata kwụrụ na Naijiria ugbu a nwere ka ọ dị. O nweelandị nwe obodo ugbu a, anyị nwa bụndị enwe enwe. Ma i kwere ma i kweghị. Naijiria bụ uru ụfọdụ, bụrụ ọghọm ọtụtụ. O mechabeghị ụbọchị atọndịamị bidoro ngosi onwe ha, ndị Fulani wakpo otu obodo n'Abịa steeti, Ozu Item, mebisịa ugbo ha, gbuwasịaọtụtụndị obodo isi, gbuo ụfọdụ, ma gwa ndị obodo n'ala nile bụ nke ha na ehi ha.
Tupu ihe a e mee, otu onye wenitere isi na obodo ahụ ma bụrụkwa SSG nke gọvanọ Abịa steeti mere ka ndị nchekwa obodo mara ihe na-esi. N'agbanyeghị nke a, ọnwụ gburu ka ọtụrụ aka. Kedu ebe “PythonDance” nọ? Ha nọ na HediBriiji Ọnịcha na-agba okoso, hụ na ụgbọ ala nile na-akpụ akpụ ka ejula.
Ndị amị kwuo na ha dị njikere ịrụọrụ ma gbochie ọgbaghara na ala Igbo. Ebe anyị kwesiri ịhụ ha bụ na ime ime obodo dịgasị iche iche, ebe ndị Fulani na-eme mpụ ha. Anyị kwesiri ịhụ ha, hụ ka ha si ejidesindị Fulani na-achị ehi ma ndị nke kwafugolu ọbara, ma ndị nke ka na-api mbazu ime nke a. Ndị uwe ojii na ndịrodsefiti ka anyị kwesiri ịhụ na okporo ụzọ, ọ bụghị ndịamị, anyị anọghị n'agha nke anyị ji abụndịemeriri emeri n'agha.
Ọ bụghị ndị na-eti mkpù Biafra bụ nsogbu, nsogbu bụ gọọmenti etiti kpachapụrụ ndị Igbo n'akụkụ.
Ndị IPOB na ndị otu ha abụghị nsogbu, nsogbu bụndịamị na ndị uwe ojii, na-agba ha egbe na ha na-eme ngagharị ha n'udo.
Ndịọrụ ugbo anyị abụghị nsogbu, nsogbu bụndị Fulani na-achị ehi na-abanye n'ugbo ha.
Mmadụ ịchọ nwere onwe abụghị nsogbu, nsogbu bụ gọọmenti etiti ipichi ha aka n'ọnụ ma na-egbusi ha.
Anyị enweghị nsogbu, kama gọọmenti na ndị ndọrọndọrọ obodo na-enye anyị nsogbu.
Ọ bịara be onye abịagbula ya, ọ laba ka mkpumkpu ghara ịpụ ya n'azụ. Ndị Igbo kwesiri ịdịkọ n'otu ugbu a. Ihe na-eme na Naijiria, ma nke nzuzo ma nke ahụrụ anya. Ọ bụ gbasaa mere na agwọ enweghị ụmụnna, anyị jìkọ aka ọnụ, nwee otu obi na ebumnuche, o nweghị ihe chere anyị n'ihu anyị agaghị eme ka ofe nkupu. Otu onye na-asụ ọhịa, ọdịkaọ na-esere eriri ọ ga-eji were kechie nkụ, ma anyụkọọmamịrịọnụ, ọ gbaa ụfụfụ.
Okwu karịrị akarị ma ka anyị kwụsị ebe a. Onye ọbụla kpachara anya n'ekeresimesi a, ọ kachasị ebe ndị amị anyị nọ.
Onye ọbụla ọ masiri nwere ike ịkwado nkọrọ a maka asụsụ Igbo.
Onye ọbụla o masiri nwere ike ịkwado nkọrọ a maka asụsụ Igbo.
Ọ bụrụ na i tozuọla ịgba akwụkwọ na-achọzi onye ọ ga-abụ gị na ya, ma ị hụbeghị... tinye isi ebe a ma zaa ajụjụ dị na ya www.odeniigbo.com/datingsite/index.php
 Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ọtụtụ maara maka ahịa gị na ihe ọbụla i na-eme, dịka ikwa akwa, isi ihe na ihe ndị ọzọ, ọrụ aka ọbụla, tinye isi ebe a ma kpọtụrụ Odeniigbo, anyị rụrụ ụlọọrụ maka ụnụ na websaịtị ...www.odeniigbo.com/marketHub.php
 Anyị nwekwara ebe dị ọhụrụ ma dịwaga iche ma nwee nchekwaba maka ndị bu HIV, ọ bụrụ na ibu ya na-achọkwazi ịgba akwụkwọ , tinye isi ebe a, i nwere ike ịhụ onye o ga-abụ gị na ya... www.odeniigbo.com/datingsite/index.php
(www.odeniigbo.com bụ websaịtị nke bụ maka nkwalite ihe nile gbasara asụsu Igbo na ndị Igbo. Ọrụ ha bụ ịhụ na asụsu Igbo n'ihe nile gbasara omenala na ndị Igbo bụ nke echekwabara na websaịtị ganye ụwatụwa. Ha si etu ahụ n'akpalite mmụọ ndị Igbo nile n'ihe gbasara ịgụ na ide asụsu Igbo. Nnọọ nu, site n'enyemaka nke Chukwu, anyị na ụnụ ga na-anọkọ kwa izuụka, ikwu maka ihe nile dị na okpuru anyanwụ n'asụsụ Igbo).
(Mazi Alokwem, Michael bụ onye Ọraeri nke dị n'okpuru ọchịchị Agụata nke Anambra steeti. O nwere nzere mmụta nke B.A na M.A na “Linguistics”, na Mahadum nke Nnamdi Azikiwe dị n'Ọka. Ọ bụ onye nwere mmasị pụrụ iche n'ebe ichekwaba na ịkwalite asụsụ Igbo na ihe nile gbasara ndị Igbo dị.)

No comments:

Post a Comment